1 N'ihi na iwu ahu, ebe o nwere nání onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia, ọ bughi ezi oyiyi onwe-ya nke ihe ndia, ha apughi ime ka ndi nābiaru ha nso zue okè mb͕e ọ bula, site n'otù àjà ndia nke ha nēche n'iru Chineke kwa-arọ mb͕e nile.
2 N'ihi na ma ọ dighi otú a, àgaghi-echebìwori ha n'iru Chineke, n'ihi na ndi nēkpe ekpere, ebe emeworo ka ha di ọcha otù mb͕e, ha agaghi-enwe akọ-na-uche ọ bula nke nmehie di iche iche ọzọ?
3 Ma nime àjà ndia ncheta nke nmehie di kwa-arọ.
4 N'ihi na ọbara nke oke-ehi na nke ewu apughi iwepu nmehie.