Ndi-Hibru 5 IGBOB

1 N'ihi na onye-isi-nchu-àjà ọ bula, esi n'etiti madu weputa ya, ọ bu n'ihi madu ka anēdo ya onye-isi-nchu-àjà n'ihe diri Chineke, ka o we nēche onyinye na àjà di iche iche n'ihi nmehie n'iru Chineke:

2 ọ bu kwa onye puru iwere nwayọ nēmeso ndi nāmaghi ihe ndi nējehie kwa ejehie, n'ihi na adighi-ike di kwa ya onwe-ya gburugburu;

3 n'ihi nka o ji kwa ugwọ iche àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, dika ọ nēchere ndi Israel, otú ahu ọ nēche-kwa-ra onwe-ya.

4 Ọ dighi kwa onye ọ bula nānara nsọpuru a n'onwe-ya, kama mb͕e Chineke nākpọ ya, ọbuná dika Ọ kpọ-kwa-ra Eron.

5 Otú a Kraist enyeghi kwa Onwe-ya otuto ka ewe me Ya onye-isi-nchu-àjà, kama ọ bu Onye siri Ya,Ọkparam ka Gi onwe-gi bu,Mu onwem amuwo Gi ta:

6 dika O si kwu kwa n'ebe di iche, si,Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebiDika usoro Melkizedek si di.

7 Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke,

8 ọ bu ezie na Ọ bu Ọkpara, ma Ọ mutara iṅa-nti-Ya site n'ahuhu nile Ọ huru;

9 ebe emesiri Ya ka O zue okè, O we ghọrọ ndi nile nāṅa Ya nti Onye nēwetara ha nzọputa ebighi-ebi;

10 Onye Chineke nyere aha onye-isi-nchu-àjà dika usoro Melkizedek si di.

11 Onye okwu ayi nwere ikwu bayere ya di uku, di kwa ike isughari asusu, ebe unu ghọworo ndi nwere nti ike.

12 N'ihi na mb͕e unu kwesiri ibu ndi-ozizí n'ihi oge, ọ di unu nkpà ọzọ ka madu zí unu ihe bu ihe-ozizí mbu nke nmalite okwu si n'ọnu Chineke puta; unu aghọwo kwa ndi miri-ara di nkpà, ọ bughi nri siri ike.

13 N'ihi na onye ọ bula nke nēketa miri-ara bu onye akānwaghi ya n'okwu ezi omume; n'ihi na ọ bu nwa ọhu.

14 Ma nri siri ike bu nke ndi tozuru okè, ndi anwaworo nghọta-ha n'ihi omume ha nēme mb͕e dum itule ihe ọma na ihe ọjọ.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13