10 Ọ bu kwa n'ọchichọ a ka edoworo ayi nsọ site n'iche aru Jisus Kraist n'iru Chineke dika àjà nání otù mb͕e.
11 Onye-nchu-àjà ọ bula nēguzo kwa kwa-ubọchi nēfè òfùfè nēche kwa otù àjà ndia n'iru Chineke ọtutu mb͕e, bú àjà nke nāpughi ihichapu nmehie mb͕e ọ bula:
12 ma Onye ahu, mb͕e O chereri otù àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, O we nọdu n'aka-nri Chineke mb͕e nile;
13 nēle anya n'oge fọduru rue mb͕e agēdo ndi-iro-Ya dika ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya abua.
14 N'ihi na O sitewo n'iche Onwe-ya n'iru Chineke dika àjà otù mb͕e me ka ndi anēdo nsọ zue okè mb͕e nile.
15 Mọ Nsọ nāb͕a-kwa-ra ayi àmà: n'ihi na mb͕e O kwuru, si,
16 Nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ha gāb͕aMb͕e ubọchi ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru;M'gētiye iwum n'obi-ha,Ọ bu kwa n'uche-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ;mb͕e ahu Ọ si,