17 M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha na nmebi-iwu nile ha ọzọ ma-ọli.
18 Ma ebe nb͕aghara ihe ndia di, iche àjà n'iru Chineke bayere nmehie adighi ọzọ.
19 Ya mere, umu-nnam, ebe ayi nwere nkwuwa-okwu ibà n'ebe nsọ ahu site n'ọbara Jisus,
20 bú uzọ O mere ọhu nye ayi, nke di ọhu di kwa ndu, site n'ákwà-nb͕ochi, nke ahu bu, anu-aru-Ya;
21 ebe ayi nwe-kwa-ra Onye-nchu-àjà uku edoro onye-isi èzí-na-ulo Chineke;
22 ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n'obi-ayi pua n'ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha:
23 ka ayi jidesie nkwuputa nke olile-anya-ayi ike ka ọ ghara iruda n'ala; n'ihi na Onye ahu Nke kwere nkwa kwesiri ntukwasi-obi: