26 N'ihi na asi na ayi were ọchichọ-obi nānọ na nmehie mb͕e ayi nataworo nmazu nke ezi-okwu, àjà agāchu bayere nmehie di iche iche afọdughi ọzọ,
27 kama nke fọduru bu oké olile-anya di egwu nke ikpé, ya na ọku nēre ike ike nke gaje iripia ndi nēguzogide Chineke.
28 Onye ọ bula nke juworo iwu Moses gānwu anwu nēmereghi ya ebere n'okwu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ:
29 ma àhuhu ahu jọkariri njọ ra aṅa, bú nke agāgu na onye ahu kwesiri ka enye ya, ka unu chère, bú onye nke zọworo Ọkpara Chineke ukwu, onye guwo-kwa-ra ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú nke eji do ya nsọ, n'ihe emeruru emeru, onye mewo-kwa-ra Mọ nke amara ihe-ihere?
30 N'ihi na ayi matara Onye ahu Nke siri, Mu nwe ọ́bọ̀, Mu onwem gēnyeghachi. Ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi gēkpe ndi-Ya ikpé.
31 Ọ bu ihe di egwu idabà n'aka Chineke di ndu.
32 Ma nēchetanu ubọchi mbu ahu, nke ọ bu nime ha, mb͕e enyesiri unu ìhè, ka unu tachiri obi n'oké ib͕a-nb͕a nke ahuhu di iche iche;