20 Okwukwe ka Aisak ji gọzie Jekob na Isọ, ọbuná ngọzi bayere ihe gaje ibia.
21 Mb͕e Jekob nānwu anwu, ọ bu okwukwe ka o ji gọzie umu-ndikom Josef n'otù n'otù; kpọ kwa isi ala nye Chineke, nādabere n'isi nkpa-n'aka-ya.
22 Mb͕e ndu Josef nāgwu, ọ bu okwukwe ka o ji kwue, ihe bayere ọpupu nke umu Israel; nye kwa iwu bayere ọkpukpu-ya.
23 Mb͕e amuru Moses, ọ bu okwukwe ka ndi muru ya ji zobe ya ọnwa atọ, n'ihi na ha huru na nwatakiri ahu mara nma; ha atughi kwa egwu ihe eze ala ahu nyere n'iwu.
24 Mb͕e Moses toruru madu, ọ bu okwukwe ka o ji ju ka akpọ ya nwa-nwoke nke nwa-nwanyi Fero;
25 n'ihi na ọ chọrọ ka emejọkọ ya na ndi nke Chineke, kama inwe ihe-utọ nke nmehie na nwa oge;
26 ebe ọ guru ita-uta nke Kraist-ayi n'àkù dikariri àkù nile nke Ijipt uku: n'ihi na ọ wepuru anya-ya le nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ahu.