1 Ya mere ka ayi onwe-ayi, ebe ayi nwere oké ìgwè ndi-àmà di otú a ndi b͕ara ayi gburugburu dika igwe-oji, ka ayi tupu kwa ibu nile ọ bula, ya na nmehie ahu nke nārapara ayi n'aru nke-uku, ka ayi were kwa ntachi-obi b͕a ọsọ ahu edebere ayi n'iru,
2 nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke.
3 na n'ihi ya, tugharianu uche n'Onye ahu Nke tachiworo obi na nkwugide di otú a, bú nke ndi-nmehie nēkwugide onwe-ha, ka ike ghara igwu unu, unu we da #mbà na nkpuru-obi-unu.
4 Unu akēguzogideghi rue ọbara, n'ib͕a nb͕a megide nmehie: