18 N'ihi na unu abiarughi ọku nke apuru idatu ya aka na nke afunwuworo, na itiri, na ọchichiri, na oké ifufe,
19 na udà opì, na olu okwu; nke ndi nuru ya riọrọ ka aghara itukwasiri ha okwu ọ bula ọzọ:
20 n'ihi na ha anānagideghi ihe enyere n'iwu, bú, Asi na ọbuná anu-ulo emetu ugwu ahu, agēwere nkume tub͕ue ya;
21 ka ihe ahu anēkiri si di kwa egwu nke-uku, Moses siri, Anamatu oké egwu, aru ma-kwa-ram jijiji:
22 kama unu abiaruwo ugwu Zaion, na obodo nke Chineke di ndu, bú Jerusalem nke di n'elu-igwe, na ọtutu ndi anāpughi iguta ọnu,
23 bú nb͕akọ ọra ndi-mọ-ozi nile, na nzukọ nke ndi eburu uzọ muputa ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ n'elu-igwe, na Chineke, bú Onye-ikpé ọra madu, na mọ nke ndi ezi omume emeworo ka ha zue okè,
24 na Jisus, bú onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, na ọbara nke nfesa nke nēkwu nke-ọma kari nke ọbara Ebel kwuru.