1 Ka ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ nādigide.
2 Unu echezọla ile ndi-ọbìa nke-ọma: n'ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbìa nāmaghi ama.
3 Nēchetanu ndi nọ n'ab͕u, dika ndi ekekọworo unu na ha n'ab͕u; nēchetanu ndi anēmejọ, dika ndi unu onwe-unu nọ kwa n'aru.
4 Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di.