3 Ayí nēkele Chineke, bú Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēkpe ekpere bayere unu mb͕e nile,
4 ebe ayi nuru okwu bayere okwukwe nke unu kwere na Kraist Jisus, na ihu-n'anya unu ji hu ndi nsọ nile,
5 n'ihi olile-anya ahu nke edebeworo unu n'elu-igwe, nke unu nuru ihe bayere ya na mbu n'okwu nke ezi-okwu nke ozi ọma,
6 nke biaruru unu; dika ọ nāmiju kwa nkpuru n'uwa nile, nāba kwa uba, dika ọ nēme kwa n'etiti unu, site n'ubọchi unu nuru mazu kwa amara Chineke n'ezi-okwu;
7 dika unu mutara n'ọnu Epafras orù-ibe-ayi onye ayi huru n'anya, onye bu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ijere Kraist ozi n'ọnọdu ayi,
8 onye gosi-kwa-ra ayi ihun-anya-unu nime Mọ Nsọ.
9 N'ihi nka ayi onwe-ayi kwa, site n'ubọchi ayi nuru ya, ayi ewepughi aka n'ikpe ekpere na iriọ aririọ n'ihi unu, ka ewe me ka unu juputa na nmazu nke ihe Ọ nāchọ nime amam-ihe na nghọta nile nke Mọ Nsọ,