6 Ya mere dika unu nara Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi, nējegharinu nime Ya,
7 buru kwa ndi b͕agideworo nkpọrọgwu nime Ya, ndi anēwuli kwa elu dika ulo nime Ya, ndi anēwere kwa okwukwe-unu me ka unu guzosie ike, dika ezíri unu, nēkelebiga ókè.
8 Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iwere ihu-amam-ihe-n'anya na aghughọ efu nke ya buru onye nēzu unu n'ori, ihu-amam-ihe-n'anya nke di ka ihe-ozizí madu nyere idebe, dika ozizí mbu nke uwa, ma ọ dighi ka Kraist si di:
9 n'ihi na nime Ya ka ozuzù nile nke ihe Chineke bu nēbigide nēwere aru madu,
10 nime Ya ka emezuwo-kwa-ra unu emezu, Onye bu isi nke ibu-onye-isi na ichi-isi nile ọ bula:
11 ọ bu kwa nime Ya ka ejiri obibì-úgwù anējighi aka me bì unu úgwù, n'iyipuchasi aru nile nke bu anu-aru, n'obibì-úgwù nke Kraist;
12 ebe elìkọrọ unu na Ya nime baptism-unu, ọ bu kwa nime ya ka esitere n'aka okwukwe-unu me ka unu so Ya bilikọ, bú okwukwe unu kwere n'ilusi-ọ1u-ike nke Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie.