5 Onye ayi sitere n'aka-Ya nata amara na ọlu onye-ozi, rue iṅa-nti nke okwukwe n'etiti mba nile, n'ihi aha-Ya:
6 ndi unu onwe-unu nọ kwa n'etiti ha, ndi akpọrọ ibu ndi nke Jisus Kraist:
7 Pọl nka nēdegara ndi nile nọ na Rom akwukwọ, bú ndi Chineke huru n'anya, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke Nna-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist bia.
8 Mbu, anamekele Chinekem ekele site na Jisus Kraist bayere unu nile, na anēkwusa okwukwe-unu n'uwa dum.
9 N'ihi na Chineke, Onye m'nēkpere nime mọm n'ozi ọma nke Ọkpara-Ya, bu Onye-àmàm, otú m'nārapughi aka n'ihota unu,
10 nāriọ aririọ mb͕e nile n'ekperem nile, ọ buru na, ma eleghi anya, ub͕u a n'oge a ezi uzọ gādirim ibiakute unu, n'ihe Chineke nāchọ.
11 N'ihi na ihu unu anya nāgusim ike, ka m'kwe ka unu keta onyinye-amara ufọdu nke Mọ Nsọ, ka ewe me ka unu guzosie ike;