Ndi Rom 3 IGBOB

1 Gini kwa ka onye-Ju nwebigara ókè? ma-ọbu ùrù gini ka ibì-úgwù bara?

2 Ọ bara urù ri nne n'uzọ nile: mbu, na ewere okwu si n'ọnu Chineke puta nye ha n'aka na ntukwasi-obi.

3 N'ihi na asi na ufọdu ekweghi, gini kwa? èkweghi-ekwe-ha gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi nke Chineke ghara idi irè?

4 Chineke ekwela: kama ka ọ puta ihè na Chineke bu Onye ezi-okwu, ma madu nile n'otù n'otù bu ndi-ugha; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ka ewe gua Gi n'onye ezi omume n'okwu-Gi nile,Ka I we kpeb͕u kwa mb͕e anēkpe Gi ikpé.

5 Ma ọ buru na ajọ omume-ayi eme ka ezi omume Chineke puta ìhè, gini ka ayi gēkwu? Chineke, Onye nēme ka iwe-Ya dakwasi ayi, Ọ̀ bu onye ajọ omume? (Anamekwu dika madu.)

6 Chineke ekwela: n'ihi na Chineke gēsi kwa aṅa kpe uwa ikpé?

7 Ma ọ buru na ezi-okwu nke Chineke babigara uba ókè n'iwetara Ya ebube site n'okwu-ugha nkem, gini mere anēkpe kwa mu onwem ikpé ọzọ dika onye-nmehie?

8 gini me-kwa-ra ayi asighi, Ka ayi me ihe ọjọ, ka ezi ihe we puta? (dika anēkwulu ayi, dika ufọdu nēkwu kwa na ayi nāsi), ndi ikpé-ha ziri ezi.

9 Gini kwa? àyi ka ha nma? É-è, ayi akaghi ha nma ma-ọli: n'ihi na ayi buru uzọ bo ndi-Ju bo kwa ndi-Grik ebubo, na ha nile nọ n'okpuru nmehie;

10 dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli;

11 Ọ dighi onye nāghọta,Ọ dighi onye nāchọ Chineke;

12 Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abaghi n'ihe n'otù;Ọ dighi onye nēme ihe ọma, ọ dighi ọbuná otù onye:

13 Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu;Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ:Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha:

14 Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu:

15 Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara;

16 Nbibi na ihuju-anya di n'uzọ nile ha;

17 Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa:

18 Egwù Chineke adighi n'anya-ha.

19 Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ:

20 n'ihi na site n'ọlu nile nke iwu ọ dighi madu ọ bula agāgu n'onye ezi omume n'iru Ya: n'ihi na ọ bu n'aka iwu ka nmazu nke nmehie sitere.

21 Ma ub͕u a emewo ka ezi omume Chineke puta ìhè nke nēguzo iche n'ebe iwu di, nke iwu ahu na ndi-amuma nāb͕ara ya àmà;

22 ma ọ bu ezi omume Chineke, site n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n'ihi na ọ dighi ihe di iche;

23 n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke;

24 anēwere kwa amara-Ya nāgu ha na ndi ezi omume n'onyinye efu site na nb͕aputa ahu nke di nime Kraist Jisus:

25 Onye Chineke chere n'iru ọra madu ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi, site n'okwukwe ekwere n'ọbara-Ya, igosi ezi omume-Ya, n'ihi nb͕aghara nmehie nile emehiereri n'oge gara aga, n'oge nnagide nke Chineke;

26 ka O we gosi ezi omume-Ya n'oge di ub͕u a, ka m'kwuru: ka Ya onwe-ya we buru onye ezi omume, buru kwa onye nāgu onye ahu n'onye ezi omume, bú onye nọ n'okwukwe ekwere na Jisus.

27 Òle ebe inya-isi-ayi di kwa? Emechibidowo ya n'èzi. Sìte n'aha iwu gini? ọ̀ bu nke ọlu? É-è: kama ọ bu site n'iwu nke okwukwe.

28 Ya mere ayi guru na anāgu madu n'onye ezi omume site n'okwukwe, mb͕e ọ kālughi ọlu iwu.

29 Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ bu Chineke nke nání ndi-Ju? Ọ̀ bughi kwa Chineke nke ndi mba ọzọ? E, ọ bu kwa nke ndi mba ọzọ:

30 asi na ọ bu ezie na Chineke bu otù, Onye gāgu ndi obibì-úgwù na ndi ezi omume site n'okwukwe, were kwa okwukwe ahu gua ndi ebìghi-úgwù na ndi ezi omume.

31 Àyi nēsite kwa n'okwukwe-ayi me ka iwu ghara idi irè? Chineke ekwela: kama ayi nēme ka iwu guzo.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16