18 Ma asim, Ọ̀ gābu na ha anughi? Ha nuru ezie,N'uwa nile ka olu-ha puru jezue,Na nsọtu nile nke elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue.
19 Ma asim, Ọ̀ gābu na Israel amaghi? Moses buru uzọ si,Mu onwem gēwere mba nābughi mba kpasue unu ekworo,Mba nēnweghi nghọta ka M'gēwere kpasue unu iwe.
20 Ma Aisaia nwere anya-ike nke-uku, we si,Ndi nāchọghm chọtaram;Ewerem gosi ndi nājughi ajuju n'akam.
21 Ma Ọ nēkwu okwu bayere Israel, si, Ogologo ubọchi dum ka M'b͕asara akam nye ndi nādighi-ekwenye, ndi nēkwugidekwam.