2 N'ihi na anamab͕ara ha àmà na ha nānu ọku n'obi n'ebe Chineke nọ, ma ọ bughi dika nmazu si di.
3 N'ihi na, ebe ha nāmaghi ezi omume Chineke, nāchọ kwa uzọ ime ka ezi omume nke aka ha guzo, ha edoghi onwe-ha n'okpuru ezi omume Chineke.
4 N'ihi na Kraist bu nsọtu iwu iwetara onye ọ bula nke kwere ezi omume.
5 N'ihi na Moses edewo n'akwukwọ na madu nke nēme ezi omume nke sitere n'iwu gādi ndu nime ya.
6 Ma ezi omume ahu nke sitere n'okwukwe nēkwu otú a, si, Asila n'obi-gi, Ònye gārigo n'elu-igwe? (nke ahu bu, ikudata Kraist:)
7 ma-ọbu, Ònye gārida n'abyss ahu? (nke ahu bu, isi na ndi nwuru anwu kugota Kraist.)
8 Kama ọ̀ bu gini ka ọ nēkwu? Okwu ahu di gi nso, n'ọnu-gi, na n'obi-gi: nke ahu bu, okwu okwukwe, nke ayi nēkwusa: