1 Ka nkpuru-obi ọ bula do onwe-ya n'okpuru ndi nāchi isi n'elu ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāchi isi ma ọ buru na Chineke edoghi ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo.
2 Ya mere onye nēdo onwe-ya megide onye ahu nāchi isi, ọ nēguzogide iwu Chineke nyere: ma ndi nēguzogide gānata ikpé nye onwe-ha.
3 N'ihi na ndi-isi abughi ihe-egwu n'ebe ezi ọlu di, kama n'ebe ọlu ọjọ di. Ma ì chọghi ka i tua egwu onye ahu nāchi isi? nēme ezi ihe, i gēnwe kwa otuto site n'aka ya:
4 n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi n'ebe i nọ iwetara gi ezi ihe. Ma ọ buru na i nēme ihe ọjọ, tua egwu; n'ihi na ọ bughi n'efu ka o nēbu mma-agha: n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi, onye-ọ́bọ̀ iwetara onye nēme ihe ọjọ iwe.
5 N'ihi ya ọ di nkpà ido onwe-unu n'okpuru ya, ọ bughi nání n'ihi iwe ahu, kama ọ bu kwa n'ihi akọ-na-uche.