20 ma nka ka m'mere nējisi ike izisa ozi ọma ahu otú a, ọ bughi ebe akpọrọri aha Kraist, ka m'ghara iwu ulo n'elu ntọ-ala onye ọzọ;
21 kama, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ,Ha gāhu, bú ndi akākọghi akukọ Ya mb͕e ọ bula,Ndi akānughi kwa gāghọta.
22 N'ihi nka eb͕ochi-kwa-ram ọtutu oge ndia ibiakute unu:
23 ma ub͕u a, ebe m'nēnweghi ebe ọ bula n'akuku ndia ọzọ, ebe ibiakute unu nāgusikwam ike ọtutu arọ ndia gara aga,
24 mb͕e ọ bula m'gāga Spain (n'ihi na anamele anya na m'gēkiri unu mb͕e m'nāgabiga, anamele kwa anya na unu gēdupum n'ijem iga ebe ahu, ma ọ buru na afọ gēburu uzọ jum n'aru unu n'akuku ufọdu)
25 ma ub͕u a, ka m'kwuru, agam Jerusalem, ebe m'nējere ndi nsọ ozi.
26 N'ihi na ọ di Masedọnia na Akaia ezi nma inye ndi-ob͕eye n'etiti ndi nsọ nọ na Jerusalem ihe ufọdu ha gēnwekọ.