22 Mu onwem, bú Tatiọs, onye nēde akwukwọ-ozi a, nēkele unu nime Onye-nwe-ayi.
23 Gaiọs, onye nēlem na nzukọ Kraist dum ọbìa, nēkele unu. Erastọs onye nāchi ihe obodo nēkele unu, na Kwọtọs nwa-nna-ayi.
24 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu nile. Amen.
25 Ma Onye ahu Nke puru ime ka unu guzosie ike dika ozi ọmam na nkwusa nke Jisus Kraist si di, dika nkpughe nke ihe-omimi ahu si di nke emeworo ka o kpuchie ọnu n'oge ebighi-ebi,
26 ma ub͕u a ka emere ka ọ puta ìhè, esite kwa n'ihe ndi-amuma deworo n'akwukwọ me ka mba nile mara ya, dika ihe Chineke ebighi-ebi nyere n'iwu si di, rue iṅa-nti nke okwukwe;
27 Chineke Nke nání Ya bu Onye-amam-ihe, site n'aka Jisus Kraist, Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.