6 Onye gēnyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya nile si di:
7 ndi site na ntachi-obi n'ezi ọlu nāchọ otuto na nsọpuru na apughi-imebi ka Ọ gēnye ndu ebighi-ebi:
8 ma ndi di n'akuku nke ikpa-iche-iche, ndi nēkweyeghi kwa ezi-okwu, kama ha nēkweye ajọ omume, iwe na ọnuma,
9 nkpab͕u na oké nkpà, gādiri ha, n'elu nkpuru-obi ọ bula nke madu onye nāluputa ihe ọjọ, nke onye-Ju na mbu, na nke onye-Grik kwa;
10 ma otuto na nsọpuru na udo gādiri onye ọ bula nke nālu ezi ọlu, onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa:
11 n'ihi na ile-madu-anya-n'iru adighi n'ebe Chineke nọ.
12 N'ihi na ka ha ra, bú ndi mehiere nēnweghi iwu, ha gāla kwa n'iyì nēnweghi iwu: ka ha ra kwa, bú ndi mehiere n'okpuru iwu, agēsite n'iwu kpe ha ikpé;