2 N'ihi na asi na aguru Abraham n'onye ezi omume site n'ọlu, o nwere ihe inya isi; ma ọ bughi n'ebe Chineke nọ.
3 N'ihi na ọ̀ bu gini ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu? Abraham we kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya dika ezi omume.
4 Ma onye nālu ọlu, agughi ugwọ-ọlu-ya nye ya dika amara, kama dika ugwọ.
5 Ma onye nālughi ọlu, kama ọ kwere n'Onye ahu Nke nāgu onye nāsọpughi Chineke n'onye ezi omume, anāgu okwukwe-ya nye ya dika ezi omume.
6 Ọbuná dika Devid nāsi kwa na madu ahu bu onye ngọzi diri, bú onye Chineke nāgu ezi omume nye ya mb͕e ọ kālughi ọlu,
7 si,Ngọzi nādiri ndi ab͕aghara nmebì-iwu nile ha,Ndi ekpuchi-kwa-ra nmehie nile ha.
8 Ngọzi nādiri nwoke ahu onye Onye-nwe-ayi nāgaghi-agu nmehie nye ya.