1 Ya mere ebe aguru ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe, ayi na Chineke di n'udo site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;
2 Onye ayi sitewo-kwa-ra n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'okwukwe-ayi nime amara nka ayi nēguzo nime ya; ayi nānya kwa isi, nādabere n'olile-anya nke otuto Chineke.
3 Ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi nime nkpab͕u-ayi nile: ebe ayi matara na nkpab͕u nāluta ntachi-obi;
4 ntachi-obi ahu nāluta kwa ọnwunwa; ọnwunwa ahu nāluta kwa olile-anya:
5 Olile-anya ahu emeghi kwa ka ihere me ayi; n'ihi na awusaworo ihu-n'anya nke Chineke n'obi-ayi site n'aka Mọ Nsọ Nke enyere ayi.