17 N'ihi na asi na ọnwu si n'aka otù onye ahu buru eze, site na ndahie nke otù onye ahu; ndi nānata nbabiga-ókè nke amara ahu na nke onyinye ahu, bú ezi omume, gābu kari eze ri nne na ndu site n'aka otù Onye ahu, bú Jisus Kraist.
18 Ya mere otú a, dika ikpé ahu sitere n'otù ndahie bia rue madu nile iwetara ha amam-ikpe; ọbuná otú a ka onyinye-amara ahu sitere n'otù ọlu ezi omume bia rue madu nile igu ha na ndi ezi omume ka ha nata ndu.
19 N'ihi na dika edoro ọra madu na ndi-nmehie site n'aṅaghi-nti nke otù madu ahu, ọbuná otú a ka agēdo ọra madu na ndi ezi omume site n'iṅa-nti nke otù Onye ahu.
20 Iwu we b͕ebà, ka ndahie ahu we rie nne; ma n'ebe nmehie riri nne, n'ebe ahu ka amara babigara ókè nke-uku kari:
21 ma, dika nmehie si buru eze n'onwu, ka amara we buru kwa eze otú a site n'ezi omume rue ndu ebighi-ebi site n'aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi.