18 ebe eme-kwa-ra ka unu pua na nmehie nwere onwe-unu, unu ghọrọ ndi-orù nke ezi omume.
19 Anamekwu dika madu n'ihi adighi-ike nke anu-aru-unu: n'ihi na dika unu chere ihe nile di unu n'aru n'iru adighi-ọcha na n'iru imebi-iwu nēdubà n'imebi-iwu ka unu buru ndi-orù-ha, otú a chenu ihe nile di unu n'aru n'iru ezi omume ub͕u a, bú nke nēdubà n'ido-nsọ, ka unu buru ndi-orù-ya.
20 N'ihi na mb͕e unu bu ndi-orù nke nmehie, unu nwere onwe-unu n'ebe ezi omume di.
21 Ọ̀ bu nkpuru gini kwa ka unu nwere n'oge ahu n'ihe nile ahu nke ihere ha nēme unu ub͕u a? n'ihi na ọgwugwu ihe nile ahu bu ọnwu.
22 Ma ub͕u a ebe unu pusiri na nmehie nwere onwe-unu, ghọ kwa ndi-orù nke Chineke, unu nwere nkpuru-unu nēweta ido-nsọ, unu nwe-kwa-ra ndu ebighi-ebi dika ọgwugwu-ya.
23 N'ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.