20 N'ihi na mb͕e unu bu ndi-orù nke nmehie, unu nwere onwe-unu n'ebe ezi omume di.
21 Ọ̀ bu nkpuru gini kwa ka unu nwere n'oge ahu n'ihe nile ahu nke ihere ha nēme unu ub͕u a? n'ihi na ọgwugwu ihe nile ahu bu ọnwu.
22 Ma ub͕u a ebe unu pusiri na nmehie nwere onwe-unu, ghọ kwa ndi-orù nke Chineke, unu nwere nkpuru-unu nēweta ido-nsọ, unu nwe-kwa-ra ndu ebighi-ebi dika ọgwugwu-ya.
23 N'ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.