5 N'ihi na mb͕e ayi nọ n'anu-aru, ọchichọ ọjọ nile nke diri nmehie nile ayi, nke sitere n'aka iwu ahu, nālusi ọlu ike n'ihe nile di ayi n'aru imiri ọnwu nkpuru.
6 Ma ub͕u a atọpuwo ayi n'iwu ahu, ebe ayi nwuru n'ebe ihe ahu di nke ejidesiri ayi ike nime ya; ya mere ayi nābu orù n'idi-ọhu nke Mọ Nsọ, ọ bughi kwa n'idi-ochie nke ihe edeworo n'akwukwọ.
7 Gini ka ayi gēkwu kwa? Ìwu ahu bu nmehie? Chineke ekwela. Kama, m'gaghi-amawori nmehie, ma ọ buru na esiteghm n'aka iwu mara ya: n'ihi na m'gaghi-amatawori agu ihe ọjọ, ma ọ buru na iwu ahu asighi, Agu ihe ọjọ agula gi:
8 ma nmehie, ebe ọ natara ihe ọ gēji megidem, o were ihe enyere n'iwu luta agu ihe ọjọ nile n'otù n'otù nimem: n'ihi na nmehie bu ihe nwuru anwu ma iwu adighi ya.
9 Ma mu onwem nādi ndu otù mb͕e n'oge iwu nādigh: ma mb͕e ihe enyere n'iwu biara, nmehie ahu we di ndu ọzọ, mu onwem we nwua;
10 ihe ahu enyere n'iwu, nke nēdubà na ndu, nka ka m'huru na ọ bu ihe nēdubà n'ọnwu:
11 n'ihi na nmehie, ebe ọ natara ihe ọ gēji megidem, o sitere n'ihe enyere n'iwu ghọb͕uem, site kwa na ya b͕uem.