22 Gini kwa, ma ọ buru na Chineke, ọ bu ezie na Ọ nāchọ igosi iwe-Ya, na ime ka amara ike-Ya, ma O were ogologo-ntachi-obi ri nne nagide ihe iwe edoziworo ka ha bà n'ila-n'iyì:
23 ka O we me kwa ka amara àkù nke ebube-Ya n'aru ihe diri ebere, nke O buru uzọ dozie ka ha ba n'ebube,
24 bú ayi onwe-ayi, ndi Ọ kpọ-kwa-ra, ọ bughi site na nání ndi-Ju, kama site kwa na ndi mba ọzọ?
25 Dika O nēkwu kwa n'akwukwọ Hosea, si,M'gākpọ ndi ahu ndim, nke nābughi ndim;M'gākpọ kwa nwanyi ahu onye ahuru n'anya, nke anāhughi n'anya.
26 O gēru kwa, na n'ebe ahu nke asiri ha, Ọ bughi ndim ka unu bu,N'ebe ahu ka agākpọ ha umu-ndikom nke Chineke di ndu.
27 Ma Aisaia nēti nkpu bayere Israel, si, Ọ buru na ọnu-ọgugu umu Israel di ka ájá nke oké osimiri, ọ bu nke fọduru ka agāzọputa:
28 n'ihí na Onye-nwe-ayi gēme ihe O kwuru n'elu uwa, nēmezu ya nēme kwa ya ka o bìe.