24 bú ayi onwe-ayi, ndi Ọ kpọ-kwa-ra, ọ bughi site na nání ndi-Ju, kama site kwa na ndi mba ọzọ?
25 Dika O nēkwu kwa n'akwukwọ Hosea, si,M'gākpọ ndi ahu ndim, nke nābughi ndim;M'gākpọ kwa nwanyi ahu onye ahuru n'anya, nke anāhughi n'anya.
26 O gēru kwa, na n'ebe ahu nke asiri ha, Ọ bughi ndim ka unu bu,N'ebe ahu ka agākpọ ha umu-ndikom nke Chineke di ndu.
27 Ma Aisaia nēti nkpu bayere Israel, si, Ọ buru na ọnu-ọgugu umu Israel di ka ájá nke oké osimiri, ọ bu nke fọduru ka agāzọputa:
28 n'ihí na Onye-nwe-ayi gēme ihe O kwuru n'elu uwa, nēmezu ya nēme kwa ya ka o bìe.
29 Ọzọ, dika Aisaia buru uzọ kwue,Ọ buru na Onye-nwe usu nile nke ndi-agha arapughi ayi otù nkpuru,Ayi gādiwori ka Sọdọm, agēmewori ayi ka ayi yie Gọmọra.
30 Gini ka ayi gēkwu kwa? Na ndi mba ọzọ, ọ bu ezie na ha ab͕asoghi ezi omume, ma ha ruru ezi omume, ma ọ bu ezi omume ahu nke si n'okwukwe puta: