11 o we hu elu-igwe ka emeghere ya-ri, ya na otù ihe ka ọ nārida, dika oké ákwà ọcha, anēsi na nkuku anọ eweda ya n'ala:
12 nke anu ukwu anọ na ihe nākpu akpu nke ala na anu-ufe nke elu-igwe nile di iche iche di nime ya.
13 Otù olu we bia rue ya nti, si, Pita, bilie; b͕ue, ri kwa.
14 Ma Pita siri, M'gaghi-eri ma-ọli, Onye-nwe-ayi; n'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula m'riri ihe ọ bula nke ruru árú nke nādighi kwa ọcha.
15 Otù olu we bia rue ya nti ọzọ nke ub͕ò abua, si, Ihe Chineke mere ka ha di ọcha, gi onwe-gi emela ha ihe ruru árú.
16 Ewe me ihe a ub͕ò atọ: ngwa ngwa ewe nara ákwà ahu rigo n'elu-igwe.
17 Ma mb͕e Pita nēnwe obi abua nime onwe-ya ihe ọ gābu, bú ọhù ọ hururi, le, ndikom ahu ndi Kọniliọs zitereri, ebe ha jusiri ajuju ulo Saimon, ha guzoro n'ọnu-uzọ-ama,