Ọlu Ndi-Ozi 6 IGBOB

1 Ma na mb͕e ahu, mb͕e ndi nēso uzọ Jisus nāba uba, ndi-Ju nāsu asusu Grik malitere itamu megide ndi-Hibru, n'ihi na elefuru ndinyom-ha ndi di-ha nwuru anya n'ije-ozi, bú ikère ndi Kraist òkè, kwa-ubọchi.

2 Ndi-ozi iri na abua ahu we kpọ ọra ndi nēso uzọ Jisus biakute ha, si, Ọ dighi utọ ka ayi rapu okwu Chineke, jere table ozi.

3 Kama, umu-nna-ayi, chọputanu n'etiti unu ndikom asa ndi ab͕ara ha ezi àmà, ndi juputara na Mọ Nsọ na amam-ihe, ndi ayi gēme ndi-isi n'ọlu a di nkpà.

4 Ma ayi onwe-ayi gānọgidesi ike n'ekpere-ayi, na n'ije ozi okwu Chineke.

5 Okwu ahu we tọ ọra ha nile utọ: ha we rọputa Stifen, bú nwoke nke juputara n'okwukwe na Mọ Nsọ, ya na Filip, na Prọkọrọs, na Naikanoa, na Taimon, na Pamenas, na Nikọlas, bú onye Antiọk nke nēso uzọ ndi-Ju:

6 ndi ha guzoro n'iru ndi-ozi: mb͕e ha kpesiri ekpere, ha we bikwasi ha aka n'isi.

7 Okwu Chineke we nāga n'iru; ọnu-ọgugu nke ndi nēso uzọ Jisus nāba kwa uba na Jerusalem ri nne; oké ìgwè ndi-nchu-àjà nāṅa kwa okwukwe ahu nti.

8 Ma Stifen, ebe o juputara n'amara na ike, ọ nālu oké ọlu-ebube na ihe-iriba-ama di iche iche n'etiti ndi-Ju.

9 Ma ufọdu biliri n'etiti ndi sitere n'ulo-nzukọ nke anākpọ ulo-nzukọ nke ndi-Libatin, na nke ndi Sairini, na nke ndi Aleksandria, na nke ndi sitere na Silisia na Esia, ha na Stifen nājurita onwe-ha ajuju.

10 Ha enweghi kwa ike iguzogide amam-ihe na Mọ Nsọ o ji ekwu okwu.

11 Mb͕e ahu ha jiri aghughọ we rọputa ndikom, ndi siri, Ayi anuwo ya ka o nēkwu okwu nēkwulu Moses na Chineke.

12 Ha we kpalie ndi-Ju, na ndi-okenye, na ndi-ode-akwukwọ, we biakwasi ya, jide ya, kubata ya na nnọkọ-ikpé,

13 we guzo ndi-àmà ugha, ndi si, Nwoke a arapughi ikwu okwu megide ebe nsọ a, na iwu-ayi:

14 n'ihi na ayi anuwo ya ka ọ nāsi, na Jisus nka, bú Onye Nazaret, gākwatu ebe a, nwo kwa ọme-n'ala nile nke Moses rara nye ayi n'aka.

15 Ndi nile ndi nọduru na nnọkọ-ikpé ahu, mb͕e ha legidere ya anya, ha we hu iru-ya dika ọ bu iru mọ-ozi.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28