4 O we legide ya anya, tu kwa egwu, si, Ọ̀ bu gini, Onye-nwe-ayi? Ọ si ya, Ekpere-gi nile na ọlu ebere gi nile rigoro ibu ihe-ncheta n'iru Chineke.
5 Ub͕u a ziga kwa ndikom na Jọpa, kpọta otù onye, bú Saimon, onye anākpọ kwa Pita:
6 onye ahu nānọ dika ọbìa n'ulo otù onye, bú Saimon, onye nēdozi akpukpọ anu, onye ulo-ya di n'usọ oké osimiri.
7 Ma mb͕e mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu lasiri, ọ kpọ madu abua nime ndi nējere ya ozi, na otù onye-agha nke nāsọpuru Chineke nime ndi nānọgide ya nso mb͕e nile;
8 mb͕e ọ kọsiri ha ihe nile, o we ziga ha na Jọpa.
9 Ma n'echi-ya, mb͕e ndi ahu nọ n'ije-ha, nābiaru kwa obodo ahu nso, Pita rigoro n'elu ulo ikpe ekpere, n'ihe ra ka oge hour nke-isi:
10 agu we gua ya, o we chọ idetu ihe ọnu: ma mb͕e ha nēdozi ihe, ihe di ka inyoghi biara ya n'anya;