1 Ma ndi-ozi na umu-nna nime Kraist ndi nọ na Judia dum nuru na ndi mba ọzọ nara-kwa-ri okwu Chineke nke-ọma.
2 Mb͕e Pita rigotara Jerusalem, ndi sitere na ndi obibì-úgwù we kwugide ya okwu,
3 si, I bakuru ndikom ndi anēbighi úgwù, so ha rie ihe.
4 Ma Pita malitere, we kọrọ ha okwu ahu n'usoro, si,