1 Ma ndi-ozi na umu-nna nime Kraist ndi nọ na Judia dum nuru na ndi mba ọzọ nara-kwa-ri okwu Chineke nke-ọma.
2 Mb͕e Pita rigotara Jerusalem, ndi sitere na ndi obibì-úgwù we kwugide ya okwu,
3 si, I bakuru ndikom ndi anēbighi úgwù, so ha rie ihe.
4 Ma Pita malitere, we kọrọ ha okwu ahu n'usoro, si,
5 Mu onwem nọ n'obodo Jọpa nēkpere: m'we hu ọhù nime inyoghi, otù ihe ka ọ nārida, dika oké ákwà ọcha nke anēsi n'elu-igwe were nkuku anọ eweda n'ala; o we bia rue ọbuná n'ebe m'nọ:
6 mb͕e m'legidere ya anya, m'we tugharia uche, hu anu ukwu anọ di n'uwa na anu-ọhia na ihe nākpu akpu na anu-ufe nke elu-igwe nile di iche iche.
7 M'we nu kwa otù olu ka ọ nāsim, Pita, bilie; b͕ue, ri kwa.