6 mb͕e m'legidere ya anya, m'we tugharia uche, hu anu ukwu anọ di n'uwa na anu-ọhia na ihe nākpu akpu na anu-ufe nke elu-igwe nile di iche iche.
7 M'we nu kwa otù olu ka ọ nāsim, Pita, bilie; b͕ue, ri kwa.
8 Ma asirim, M'gaghi-eri ma-ọli, Onye-nwe-ayi: n'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ihe ọ bula nke ruru arú ma-ọbu nke nādighi ọcha bàra n'ọnum.
9 Ma otù olu zara nke ub͕ò abua site n'elu-igwe, si, Ihe Chineke mere ka ha di ọcha, gi onwe-gi emela ha ihe ruru arú.
10 Ewe me nka ub͕ò atọ: ewe dọlie ha nile ọzọ n'elu-igwe.
11 Ma le, n'otù oge ahu ndikom atọ guzoro n'iru ulo nke ayi nọ nime ya, ebe esiri na Sisaria ziterem ha.
12 Mọ Nsọ we gwam ka m'so ha, ghara ime onwem di iche. Umu-nna-ayi isi ndia we sokwam; ayi we ba n'ulo nwoke ahu: