21 Emesia ha riọ ka enye ha eze: Chineke we nye ha Sọl nwa Kish, nwoke nke sitere n'ebo Benjamin, onye chiri eze ọgu arọ abua.
22 Mb͕e O wepusiri ya, O welie Devid ibu eze-ha; onye Ọ b͕a-kwa-ra àmà, si, Achọtawom Devid nwa Jesi, nwoke nke di ka obim si achọ, onye gēme ihe nile M'nāchọ.
23 Site na nkpuru nwoke a ka Chineke wetara Israel Onye-nzọputa, bú Jisus, dika nkwa-Ya si di;
24 mb͕e Jọn buru uzọ kwusa baptism nke nechègari nye ndi Israel nile, mb͕e Ọ kābataghi.
25 Ma mb͕e Jọn nāb͕azu ọsọ-ya, ọ si, Gini ka unu nēchè na abum? Mu onwem abughi Ya. Kama, le, otù Onye nābia n'azum, Onye m'nēkwesighi itọpu akpukpọ-ukwu nke ukwu-Ya.
26 Umu-nnem, umu eriri Abraham, na ndi di n'etiti unu nātu egwu Chineke, ọ bu ayi onwe-ayi ka eziputara okwu nke nzọputa nka.
27 N'ihi na ndi bi na Jerusalem, na ndi-isi-ha, ebe ha nāmataghi Ya, na olu ndi-amuma nke anāgu n'ubọchi-izu-ike nile, ha mezuru ha n'ima Ya ikpé.