47 n'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi nyeworo ayi iwu, si,Edebewom I ka I buru ìhè nke mba nile,Ka I we di inye nzọputa rue nsọtu uwa.
48 Ma mb͕e ndi mba ọzọ nuru nka, ha ṅuria, nye kwa okwu Chineke otuto: ha we kwere na Jisus, ka ha ra, bú ndi edoro inata ndu ebighi-ebi.
49 Ewe nēbu okwu Onye-nwe-ayi jezu ala ahu dum.
50 Ma ndi-Ju kwaliri ndinyom nātu egwu Chineke, bú ndi anāsọpuru, na ndi-isi obodo ahu, ha we kpalie nsob͕u megide Pọl na Banabas, we chupu ha n'ókè-ala-ha.
51 Ma ha rupuru ájá nke ukwu-ha megide ha, we bia rue Aikọniọm.
52 Ndi nēso uzọ Jisus we juputa n'ọṅù na Mọ Nsọ.