5 Mb͕e ndi mba ọzọ na ndi-Ju kwa, ha na ndi-isi-ha, nukọtara ime ha ihe-ihere, na itu ha nkume,
6 ha we mata, b͕alaga n'obodo nke Laikaọnia, bú Listra na Dabe, na ala di ha buruburu:
7 n'ebe ahu ka ha nēzisa kwa ozi ọma.
8 Ma na Listra otù nwoke nānọdu ala, nke ukwu-ya abua nēnweghi ike, bú onye-ngwurọ site n'afọ nne-ya, onye ọ dighi mb͕e ọ bula o jereri ije.
9 Onye a nuru Pọl ka o nēkwu: onye, ebe o legidere ya anya, ebe ọ hu-kwa-ra na o nwere okwukwe agēji zọputa ya,
10 o were oké olu si, Bilie, guzo ọtọ n'ukwu-gi abua. O we wulie je kwa ije.
11 Mb͕e ìgwè madu nile huru ihe Pọl mere, ha welie olu-ha, nāsi n'asusu Laikaọnia, Chi-ayi ridatakuru ayi n'oyiyi madu.