8 Ma na Listra otù nwoke nānọdu ala, nke ukwu-ya abua nēnweghi ike, bú onye-ngwurọ site n'afọ nne-ya, onye ọ dighi mb͕e ọ bula o jereri ije.
9 Onye a nuru Pọl ka o nēkwu: onye, ebe o legidere ya anya, ebe ọ hu-kwa-ra na o nwere okwukwe agēji zọputa ya,
10 o were oké olu si, Bilie, guzo ọtọ n'ukwu-gi abua. O we wulie je kwa ije.
11 Mb͕e ìgwè madu nile huru ihe Pọl mere, ha welie olu-ha, nāsi n'asusu Laikaọnia, Chi-ayi ridatakuru ayi n'oyiyi madu.
12 Ha we kpọ Banabas, Jupita; kpọ kwa Pọl, Makuri, ebe ya onwe-ya bu onye-isi nēkwu okwu.
13 Onye-nchu-àjà nke Jupita, nke ulo nsọ ya di n'iru obodo ahu, we sekputa ehi weta kwa okoko-osisi n'ọnu-uzọ-ama obodo, ya na ìgwè madu ahu we chọ ichu àjà.
14 Ma mb͕e ndi-ozi ahu, bú Banabas na Pọl, nuru ya, ha dọwa uwe-ha, we pua b͕abà n'etiti ìgwè madu ahu, nēti nkpu,