5 Ya mere anēnye nzukọ Kraist ike n'okwukwe-ayi, ọnu-ọgugu-ha nābabiga kwa uba ókè kwa-ubọchi.
6 Ha we nāgabiga n'ala Frijia na Galetia, ebe Mọ Nsọ b͕ochiri ha ikwu okwu Chineke n'Esia;
7 mb͕e ha biara na ncherita-iru Misia, ha we nwa iga na Bitinia; ma Mọ nke Jisus ekweghi ha;
8 ha we gabiga akuku Misia, we ridata na Troas.
9 Ewe me ka Pọl hu ọhù n'abali: Otù nwoke, bú onye Masedọnia, nēguzo, nāriọ ya, si, Gabita na Masedọnia, yere ayi aka.
10 Mb͕e ọ husiri ọhù ahu, ngwa ngwa ayi we chọ uzọ ipu ka ayi ba na Masedọnia, ebe ayi sikwutara n'obi-ayi na Chineke kpọrọ ayi-ri izì ha ozi ọma.
11 Ya mere ayi siri na Troas nupu ub͕ọ, we ga otù iru rue Samọtresi, n'echi-ya ayi we rue Neapọlis;