17 Ya mere ọ nāgwa ndi-Ju na ndi nātu egwu Chineke okwu n'ulo-nzukọ, ọ nāgwa kwa ndi ọ nēzute n'ọma-ahia okwu kwa-ubọchi.
18 Ufọdu kwa nime ndi-Epikurean na ndi-Stoik, bú ndi nāhu amam-ihe n'anya, we zute ya. Ufọdu we si, Gini ka onye-ekwukwu a nāchọ ikwu? ndi ọzọ nāsi kwa, Ọ di ka onye nēkwusa ndi-mọ nke ala ọzọ: n'ihi na ọ nēzisa ozi ọma nke Jisus na nbilite-n'ọnwu-Ya.
19 Ha we jide ya, kuru ya je n'iru Areọpagọs, si, Àyi puru ima ihe ozizí ọhu nka bu, nke i nēkwu?
20 N'ihi na i nēweta na nti-ayi ihe ufọdu nke ala ọzọ: ya mere ayi nēzube ima isi ihe ndia.
21 (Ma ndi Atens nile na ndi ala ọzọ ndi nọ dika ọbìa n'ebe ahu enweghi oghere ime ihe ọzọ di iche, ma-ọbughi ikwu ma-ọbu inu ihe dikariri ọhu.)
22 Pọl we guzo n'etiti Areọpagọs, si,Ndikom nke Atens, n'ihe nile ahuwom na unu nāsọpuru ndi-mọ-unu nke-uku.
23 N'ihi na mb͕e m'nāgabiga, nēkiri kwa ihe di iche iche unu nāsọpuru, m'we hu otù ebe-ichu-àjà nke edekwasiri ihe a n'elu ya, ENYERE CHI NKE ANĀMAGHI AMA. Ya mere ihe unu nāsọpuru nāmaghi ama, nka ka mu onwem nēkwusara unu.