17 Ha nile we jide Sostenis, bú onye-isi ulo-nzukọ, tie ya ihe n'iru oche-ikpé ahu. Ọ dighi kwa ihe ọ bula n'ihe ndia meturu Galio n'obi.
18 Mb͕e Pọl nọgidesiri ọtutu ubọchi ọzọ, ọ kele umu-nna nime Kraist ekele ikpe-azu, we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ ije Siria, Prisila na Akwila soro kwa ya; mb͕e ọ kpachasiri agiri-isi-ya na Kenkrei: n'ihi na ọ kwereri Chineke nkwa.
19 Ha we rue Efesọs, o we rapu ha n'ebe ahu: ma ya onwe-ya batara n'ulo-nzukọ-ha, we gwa ndi-Ju okwu.
20 Ma mb͕e ha kpere ya ka ọ nọgide oge dikariri anya, o kweghi;
21 ma mb͕e o kelesiri ha ekele ikpe-azu, si kwa, M'gālaghachikute unu ọzọ, ma Chineke kwe, o si n'Efesọs nupu ub͕ọ.
22 Mb͕e ọ puru n'ub͕ọ na Sisaria, ọ rigo kele nzukọ Kraist, we ridata n'Antiọk.
23 Mb͕e ọ nọsiri n'ebe ahu oge ufọdu, ọ pua, we nāgabiga nime ala Galetia na Frijia n'usoro, nēme ka ndi nile ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike.