30 Ya mere ebe ọ bu onye-amuma, mata kwa na Chineke ṅuru ya-ri iyi, na Ọ gēwere otù Onye nime ndi bu nkpuru si ya n'afọ puta me ka Ọ nọkwasi oche-eze-ya;
31 ebe o buru uzọ hu nka a o kwuru okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke Kraist ahu, na arapughi Ya nime Hedis, anu-aru-Ya ahughi kwa ire-uré.
32 Jisus nka ka Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, nke ayi onwe-ayi nile bu ndi-àmà-ya.
33 Ya mere, ebe eweliri Ya elu site n'aka-nri Chineke, ebe Ọ nata-kwa-ra n'aka Nna-Ya nkwà ahu, bú Mọ Nsọ, Ọ wusara nka unu onwe-unu nāhu nānu kwa.
34 N'ihi na Devid arigoghi n'elu-igwe: ma ya onwe-ya si,Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim,
35 Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi nke ukwu-Gi abua.
36 Ya mere ka ulo Israel nile mazue, na Chineke mere Ya ka Ọ buru Onye-nwe-ayi na Kraist-ayi, bú Jisus ahu Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe.