22 Ma ub͕u a, le, mu onwem nāga Jerusalem n'ab͕u nime mọ nkem, nāmataghi ihe ọ bula gābiakwasim n'ebe ahu:
23 ọ bu nání na Mọ Nsọ nāgwasim ike n'obodo nile n'otù n'otù, nāsi na ab͕u na nkpab͕u nādigide nēchem.
24 Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n'ebe mu onwem nọ, ka m'we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m'natara n'aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke.
25 Ma ub͕u a, le, mu onwem matara na unu onwe-unu nile, ndi m'jeghariri n'etiti unu nēkwusa ala-eze Chineke, na unu agaghi-ahu irum ọzọ.
26 N'ihi ya agwasim unu ike ubọchi ta, na adim ọcha n'ebe ọbara madu nile di.
27 N'ihi na egwu emeghm ka m'ghara ikọrọ unu ìzù nile nke Chineke.
28 Nēzenu onwe-unu na ìgwè aturu ntà nile, nke Mọ Nsọ mere unu ndi nēlekota ya anya n'etiti ya, ka unu nāzù nzukọ Chineke dika aturu, nke O ji ọbara nke Ya onwe-ya zutara Onwe-ya.