1 Pọl we legide nnọkọ-ikpé ahu anya, si Umu-nnam, mu onwem ewerewo ezi akọ-na-uche nile biri n'iru Chineke dika onye-Ju rue ubọchi ta.
2 Onye-isi-nchu-àjà, bú Ananaias, we gwa ndi guzoro ya nso ka ha tie ya aka n'ọnu.
3 Mb͕e ahu Pọl siri ya, Chineke gaje iti gi aka, gi mb͕idi etere nzu: gì onwe-gi nānọdu kwa ala ikpem ikpé dika iwu-ayi si di, i we kwue ka etiem aka n'uzọ megidere iwu ahu?
4 Ndi guzoro nso we si, Ì nēkwutọ onye-isi-nchu-àjà nke Chineke?
5 Pọl we si, Amataghm, umu-nnem, na ọ bu onye-isi-nchu-àjà: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ekwula okwu ọjọ megide onye-isi ọ bula nke ndi nke gi.
6 Ma mb͕e Pọl matara na otù uzọ nime ha bu ndi-Sadusi, ma uzọ nke-ọzọ bu ndi-Farisi, o tiri nkpu nime nnọkọ-ikpe ahu, si, Umu-nnem, mu onwem bu onye-Farisi, nwa ndi-Farisi: anēkpe mu onwem ikpé bayere olile-anya na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu.