1 Ya mere Festọs, mb͕e ala ahu batasiri n'aka-ya, mb͕e ubọchi atọ gasiri o si na Sisaria rigoro Jerusalem.
2 Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi n'etiti ndi-Ju we kọrọ ya akukọ megide Pọl; ha riọkwa-ra ya,
3 nāchọ amara imegide ha, ka ọ kpọta ya na Jerusalem; ebe ha nēche anwu ib͕u ya n'uzọ.
4 Otú ọ di, Festọs zara, si na anēdebe Pọl na Sisaria, si kwa na ya onwe-ya gaje ilaghachi ọsọsọ.