11 Ya mere ọ buru na emem ajọ omume, ọ buru kwa na emewom ihe kwesiri ọnwu, ariọghm ib͕anari ọnwu: ma ọ buru na ọ dighi ihe bu ezi-okwu n'ebubo ndikom ndia nēbom, ọ dighi onye ọ bula puru iwerem nye ha n'amara. Ọ bu Sisa ka m'nākpọku.
12 Mb͕e ahu Festọs, mb͕e ya na nnọkọ-ikpé-ya b͕asiri ìzù, ọ zara, si, I kpọkuwo Sisa: ọ bu Sisa ka i gāgakuru.
13 Ma mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, Agripa, bú eze, na Banaisi ruru Sisaria, kele kwa Festọs.
14 Mb͕e ha nānọgide n'ebe ahu ọtutu ubọchi, Festọs we debe okwu bayere Pọl n'iru eze ahu, si, Otù nwoke di onye Filiks rapuworo n'ulo-nkpọrọ:
15 mb͕e m'nọ na Jerusalem, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju we gwam okwu bayere ya, nāriọ ka ama ya ikpé.
16 M'we za ha, si, na ọ bughi ọme-n'ala nke ndi Rom iwere amara rara madu ọ bula nye, ma ọ buru na onye anēbo ebubo ebughi uzọ nwe ndi nēbo ya n'iru ya, hu kwa uzọ igọpu onwe-ya n'ihe eboro ya.
17 Ya mere mb͕e ha biakọrọ n'otù n'ebe a, alaghm azu, ma ubọchi so ya m'nọduru n'oche-ikpé, si ka ekuta nwoke ahu.