3 nke ka ebe i mazuru ọme-n'ala nile na ajuju nile di n'etiti ndi-Ju: n'ihi ya ariọm i ka i were ogologo-ntachi-obi nurum.
4 Ya mere, ndi-Ju nile matara ibi-obim site na nwata, nke sitere na mbu di n'etiti mba nke akam, na nime Jerusalem;
5 ebe ha buru uzọ maram site na mbu, ọ buru na ha chọrọ ib͕a àmà, na adim ndu ka onye-Farisi dika irọ-òtù ahu si di nke nēdebezu iwu kari n'uzọ ikpere Chineke ayi.
6 Eguzo-kwa-ram n'ebe a ub͕u a, ebe anēkpem ikpé bayere olile-anya nkwa ahu nke Chineke kwere nna-ayi-hà;
7 bú nkwa nke ebo-ayi iri na abua nēle anya na ha gēru, site n'ikpere Chineke si-ike abali na ehihie. Ọ bu kwa olile-anya nka ka ndi-Ju nēbom ebubo bayere ya, eze!
8 Gini mere anātule ya n'ihe anāgaghi-ekwe n'etiti unu, ma ọ buru na Chineke nēme ka ndi nwuru anwu si n'onwu bilie?
9 N'ezie mu onwem chère n'obim, na aghaghm ime ọtutu ihe megide aha Jisus onye Nazaret.