8 Gini mere anātule ya n'ihe anāgaghi-ekwe n'etiti unu, ma ọ buru na Chineke nēme ka ndi nwuru anwu si n'onwu bilie?
9 N'ezie mu onwem chère n'obim, na aghaghm ime ọtutu ihe megide aha Jisus onye Nazaret.
10 Nke m'me-kwa-ra na Jerusalem: mu onwem mechibido-kwa-ra ọtutu ndi nsọ n'ulo-nkpọrọ, ebe m'natara ike site n'aka ndi-isi-nchu-àjà, mb͕e eb͕uru ha m'we kweye imegide ha.
11 Esite-kwa-ram n'ime ka ha hu ahuhu-nmehie ọtutu mb͕e n'ulo-nzukọ nile chọ uzọ ime ka ha kwulu Chineke; ebe anya nādighm nma gabiga ókè megide ha, m'we nēsob͕u ha we rue obodo di iche eche di n'azu ala-ayi.
12 N'ime ihe ndia mb͕e m'nāga Damaskọs, ebe m'natara ike na nkweye n'aka ndi-isi-nchu-àjà,
13 n'etiti ehihie, eze, ahurum n'uzọ ìhè sitere n'elu-igwe, kariri onwunwu anyanwu, ka ọ nēnwu mu na ndi sorom n'ije buruburu.
14 Mb͕e ayi nile dasiri n'ala, m'we nu otù olu ka ọ nāsim n'asusu Hibru, Sọl; Sọl, gini mere i nēsob͕um? ọ di ike ka i b͕a ndudu eji achu ehi ukwu.