19 Ya mere chègharianu, chighari-kwa-nu, ka ewe hichapu nmehie nile unu, ka oge inwe ume ndu we si n'iru Onye-nwe-ayi bia otù a;
20 ka O we zite kwa Kraist ahu Onye eburu uzọ rọputara unu, bù Jisus:
21 Onye elu-igwe aghaghi inara nke-ọma rue oge agēme ka ihe nile di ka ha di na mbu, bù oge nke Chineke kwuru okwu bayere ha site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ ndi sitere na nmalite oge a.
22 Moses kwuru n'ezie, si, Onye-nwe-ayi Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n'etiti umu-nne-unu; Onye ahu ka unu gēge nti n'ihe nile, ka ha ra, bù nke Ọ gāgwa unu.
23 Ma ọ gēru, na madu ọ bula, nke nāgaghi-ege nti Onye-amuma ahu, agēkpochapu ya n'etiti ndim.
24 E, ndi-amuma nile site na Samuel na ndi soro ya n'azu, ka ha ra, bù ndi kwuru, ha kwusa-kwa-ra okwu banyere ubọchi nda.
25 Unu onwe-unu bu umu ndi-amuma, na umu ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Chineke na nna-unu-hà b͕ara, mb͕e Ọ siri Abraham, Ọ bu kwa na Nkpuru-gi ka agāgọzi ab͕uru niile nke uwa.