39 ma ọ buru na o sitere n'aka Chineke, unu agaghi-apu ikwatu ha n'ala; ka aghara ihu unu dika ndi nālu kwa ọ̀gù megide Chineke ma eleghi anya.
40 Ha we kweyere ya: mb͕e ha kpọsiri ndi-ozi biakute ha, ha pia ha ihe, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu n'aha Jisus, ha we rapu ha ka ha la.
41 Ya mere ha siri n'iru nnọkọ-ikpé ahu la, nāṅuri na aguru ha na ndi kwesiri ka eme ha ihe-ihere n'ihi Aha ahu.
42 Ma kwa-ubọchi, n'ulo uku Chineke na n'ulo nke aka ha, ha adighi-arapu izí ihe na izisa ozi ọma Jisus, na Ọ bu Kraist.