19 Onye ahu were aghughọ meso ndi-aru-ayi, me kwa nna-ayi-hà ihe ọjọ, ka ha we tufue umu ọhu ha ka aghara ime ka ha di ndu.
20 N'oge ahu ka amuru Moses, o we ma nma nke-uku; ewe zùa ya ọnwa atọ n'ulo-ya:
21 ma mb͕e etufuru ya, nwa-nwanyi Fero paliri ya, zùa ya ka ọ buru nwa ya onwe-ya nwere.
22 Ewe zí Moses ihe n'amam-ihe nile nke ndi Ijipt; o we di ike n'okwu-ya na ọlu-ya nile.
23 Ma mb͕e o rubere ọgu arọ abua, ileta umu-nne-ya, bú umu Israel, batara n'obi-ya.
24 Ma mb͕e ọ huru otù onye nime ha ka anēmejọ, ọ lubara ya ọ̀gù, we kpeputa onye anēmub͕u, ebe o tib͕uru onye Ijipt:
25 ma o chère na umu-nne-ya ghọtara na Chineke nēsi n'aka-ya enye ha nzọputa; ma ha aghọtaghi.